Oge/afọ mmalite | 1991 |
---|---|
mba/obodo | Naijiria |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Rivers state |
dị na mpaghara oge | UTC+01:00 |
nhazi ọnọdụ | 4°52′41″N 7°7′42″E, 4°53′13″N 7°7′31″E |
ụlọ ọrụ nke onye isi gọọmentị nwere | onyeisi oche nwaanyi |
postal code | 502 |
Koodu ọkpụkpọ obodo | +234 |
Oyigbo amakwaara dị ka Obigbo bụ ọchịchị ime obodo dị na Rivers Steeti, Naijiria. Ọ bụ obodo, [1] kilomita iri atọ site na Port Harcourt, km irí abụọ na ise site na obodo Aba . Ọ bụ ndị Asa ka ndị Igbo bi bụ ndị a na-ahụkwa na ọdịda okpuru ọchịchị Ukwa na Abia steeti na ndị Ndoki dị na okpuru ọchịchị ọwụwa anyanwụ Ukwa nke Abia steeti na okpúru ọchịchị Ukanafun nke Akwa ibom steeti.
Onye isi Precious Oforji bụ onye a họpụtara onyeisi oche nke ọchịchị ime obodo Oyigbo n'afọ 2008. [2] EZE Mike Nwaji echiri eze ọdịnala Obigbo n'afo1998. [3] Obodo na obodo nta dị n'okpuru ọchịchị Oyigbo gụnyere : Obigbo district; Asa, Komkom, Obeama, Obigbo, ebe ndị Ndoki district ha gụnyere Afa Uku, Afam, Afam Nta, Azusogu, Egberu, Mgboji, Mrihu, Obeakpu, Obeta, Obumku,Okoloma, Okponta, Umuagbai, Umuosi. [3]
N'ihi ebe Oyigbo dị, e nwere esemokwu dị n'etiti steeti ndị gbara agbata obi, Rivers steeti na steeti Abia gbasara nke steeti kwesịrị ị nweta ọchịchị ime obodo Oyigbo . Ka e nwechara mkparịta ụka ọtụtụ oge n'etiti steeti abụọ ahụ metụtara, e nwere nkwekọrịta na Oyigbo ga-adị ka akụkụ nke steeti Rivers . [4]